Cover Image for Okirikiri Nkata Igbo: Aha Anyị, Akụkọ Anyị
Cover Image for Okirikiri Nkata Igbo: Aha Anyị, Akụkọ Anyị
Hosted By
27 Going

Okirikiri Nkata Igbo: Aha Anyị, Akụkọ Anyị

Hosted by Nkata Igbo
Registration
Welcome! To join the event, please register below.
About Event

​🗣️ THEME: Okirikiri Nkata Igbo: Aha Anyị, Akụkọ Anyị

​Aha gị pụtara gịnị? Ònye nyere gị ya? Gịnị mere ha ji họrọ ya? 🤔

​Aha Igbo abụghị naanị ihe anyị ji akpọ ibe anyị. Ọtụtụ mgbe, aha bụ akụkọ, ekpere, olileanya, ahụmahụ, okwukwe, na ihe ezinụlọ ji kpọrọ ihe.

​N’otu Okirikiri a, ka anyị nọdụ ala, kparịta ụka, gee akụkọ ibe anyị ntị, ma chọpụta ihe dị n’azụ aha ndị anyị na-akpọ kwa ụbọchị.

​Ọ bụrụ na ị maara ihe aha gị pụtara, bịa kọọ ya. Ọ bụrụ na ị maghị, ọ bụ ohere ịchọpụta ya! Ọ bụrụkwa na ị nwere aha Igbo pụrụ iche ị chọrọ ịkọrọ anyị, anyị chọrọ ịnụ ya. 😊

​Mkparịta ụka a ga-abụ 80–100% n’asụsụ Igbo — ohere anyị ga-eji kwuo Igbo, mụta okwu ọhụrụ, cheta ihe ndị anyị maara, ma nwee ọṅụ n’asụsụ na omenala anyị.

​Onye nnabata: Dr. Chigozie Nweke-Eze

​Onye nnabata nke abuo: Maazi Chima Nwoke

​Onye Okachamara: Maazi Obioha Mmezi

​Onye Okachamara nke abuo: Maazi Onyekachi Ogbu.

​💬 Ajụjụ anyị ga-amalite na ya:

​“Aha gị ọ̀ bụ naanị aha, ka ọ̀ bụ akụkọ ndụ gị?”

​Bịa na akụkọ gị. Bịa na aha gị. Bịa na Igbo gị. Ka anyị kparịta ya ọnụ — n’Igbo! ❤️

​Debanye aha ugbu a ma sonye na Okirikiri Nkata Igbo.

​

​Translation

​🗣️ Nkata Igbo: Our Names, Our Stories

​What does your name mean? Who gave it to you? Why did they choose it? 🤔

​An Igbo name is not simply something we use to call one another. Often, a name carries a story, a prayer, a hope, an experience, a belief, and the values that matter to a family.

​In this Nkata Igbo Roundtable, let’s sit together, share stories, listen to one another, and discover what lies behind the names we use every day.

​If you know what your name means, come and share it. If you don’t, this is your chance to find out! And if you have a special Igbo name or story you’d like to share, we want to hear it. 😊

​The discussion will be 80–100% in Igbo — an opportunity to speak Igbo, learn new words, reconnect with what we already know, and enjoy our language and culture together.

​Moderator 1: Dr. Chigozie Nweke-Eze

​Moderator 2: Maazi Chima Nwoke

​Language Curator 1: Maazi Obioha Mmezi

​Language Curator 2: Maazi Onyekachi Ogbu.

​💬 Our opening question:

​“Is your name just a name, or is it the story of your life?”

​Bring your story. Bring your name. Bring your Igbo. Let’s talk about it together — in Igbo! ❤️

​Register now and join the Nkata Igbo Roundtable.

Location
https://meet.google.com/sre-fvmk-ebf
Hosted By
27 Going