

Okirikiri Nkata Igbo: Aha Anyị, Akụkọ Anyị
🗣️ THEME: Okirikiri Nkata Igbo: Aha Anyị, Akụkọ Anyị
Aha gị pụtara gịnị? Ònye nyere gị ya? Gịnị mere ha ji họrọ ya? 🤔
Aha Igbo abụghị naanị ihe anyị ji akpọ ibe anyị. Ọtụtụ mgbe, aha bụ akụkọ, ekpere, olileanya, ahụmahụ, okwukwe, na ihe ezinụlọ ji kpọrọ ihe.
N’otu Okirikiri a, ka anyị nọdụ ala, kparịta ụka, gee akụkọ ibe anyị ntị, ma chọpụta ihe dị n’azụ aha ndị anyị na-akpọ kwa ụbọchị.
Ọ bụrụ na ị maara ihe aha gị pụtara, bịa kọọ ya. Ọ bụrụ na ị maghị, ọ bụ ohere ịchọpụta ya! Ọ bụrụkwa na ị nwere aha Igbo pụrụ iche ị chọrọ ịkọrọ anyị, anyị chọrọ ịnụ ya. 😊
Mkparịta ụka a ga-abụ 80–100% n’asụsụ Igbo — ohere anyị ga-eji kwuo Igbo, mụta okwu ọhụrụ, cheta ihe ndị anyị maara, ma nwee ọṅụ n’asụsụ na omenala anyị.
Onye nnabata: Dr. Chigozie Nweke-Eze
Onye nnabata nke abuo: Maazi Chima Nwoke
Onye Okachamara: Maazi Obioha Mmezi
Onye Okachamara nke abuo: Maazi Onyekachi Ogbu.
💬 Ajụjụ anyị ga-amalite na ya:
“Aha gị ọ̀ bụ naanị aha, ka ọ̀ bụ akụkọ ndụ gị?”
Bịa na akụkọ gị. Bịa na aha gị. Bịa na Igbo gị. Ka anyị kparịta ya ọnụ — n’Igbo! ❤️
Debanye aha ugbu a ma sonye na Okirikiri Nkata Igbo.
Translation
🗣️ Nkata Igbo: Our Names, Our Stories
What does your name mean? Who gave it to you? Why did they choose it? 🤔
An Igbo name is not simply something we use to call one another. Often, a name carries a story, a prayer, a hope, an experience, a belief, and the values that matter to a family.
In this Nkata Igbo Roundtable, let’s sit together, share stories, listen to one another, and discover what lies behind the names we use every day.
If you know what your name means, come and share it. If you don’t, this is your chance to find out! And if you have a special Igbo name or story you’d like to share, we want to hear it. 😊
The discussion will be 80–100% in Igbo — an opportunity to speak Igbo, learn new words, reconnect with what we already know, and enjoy our language and culture together.
Moderator 1: Dr. Chigozie Nweke-Eze
Moderator 2: Maazi Chima Nwoke
Language Curator 1: Maazi Obioha Mmezi
Language Curator 2: Maazi Onyekachi Ogbu.
💬 Our opening question:
“Is your name just a name, or is it the story of your life?”
Bring your story. Bring your name. Bring your Igbo. Let’s talk about it together — in Igbo! ❤️
Register now and join the Nkata Igbo Roundtable.